Ezekiel 18

Mkpụrụobi mehiere ga-anwụ

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, sị, 2“Gịnị ka unu bụ mmadụ na-ekwu mgbe unu na-atụ ilu a banyere ala Izrel?

“ ‘Ndị bụ nna eriela mkpụrụ vaịnị na-achaghị acha,
eze ụmụntakịrị a na-eru ha izizi.’
3“Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, unu agaghị atụkwa ilu a ọzọ nʼala Izrel. 4Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.

5“Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omume
nke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma,
6onye na-adịghị eje nʼugwu iri oriri
maọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị,
onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya,
maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya.
7Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ,
kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe,
ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,
kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri,
na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi.
8Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa,
ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha.
Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya,
na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya.
9Ọ na-edebezu iwu m niile,
na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi.
Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ;
ọ ghaghị ịdịkwa ndụ,
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
10“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche, 11ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a:

“Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu,
na-emerụ nwunye onye agbataobi ya;
12Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa.
Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike.
Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe.
Ọ na-efe arụsị,
na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche.
13Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma.
O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya.

14“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ.

15“Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu
maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel.
Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya.
16Ọ dịghị emegbu onye ọbụla,
maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ.
Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,
kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya,
na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi;
17ọ bụrụ na ọ dịghị etinye aka na mmehie ọbụla,
na ọ naghị anara ọmụrụnwa na ụma nʼaka ndị o binyere ego,
na ọ na-erubekwara iwu m niile isi, na-agbaso ụkpụrụ m niile.
Onye dị otu a agaghị anwụ nʼihi mmehie nke nna ya mere. Ọ ga-adị ndụ.
18Ma nna ya ga-anwụ nʼihi mmehie niile o mere, nʼihi na ọ bụ onye na-ewe ihe na-abụghị nke ya, onye na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere nʼike. Ọ bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ dị iche iche nʼetiti ndị ya.

19“Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị mere nwa adịghị eketa oke nʼahụhụ nke ajọ omume nna ya?’ Ihe dị otu ahụ apụghị ime, ebe ọ bụ na nwa ya emeela ihe ziri ezi ma leziekwa anya debezuo ụkpụrụ m niile, ọ ghaghị ịdị ndụ. 20Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere.

21“Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. 22Ọ dịghị ajọ omume niile bụ nke ha mere a ga-echeta megide ha. Ha ga-adị ndụ nʼihi ihe ezi omume ha mere. 23Ọ na-atọ m ụtọ bụ ọnwụ nke ndị ajọ omume? Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Kama, ọ bụghị mgbe ha si nʼụzọ ha chigharịa, dịrị ndụ, ka obi na-atọ m ụtọ?

24“Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa, mee mmehie na-emekwa ihe arụ nke ndị ajọ mmadụ na-eme, ha ọ ga-adị ndụ? Mba! Ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha, ha bụ ndị ikpe mara, nʼihi mmehie ndị ha mere, ha ga-anwụ.

25“Ma unu na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel. Ọ bụ nʼụzọ m ezighị ezi? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi? 26Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime mmehie, ọ ga-anwụ maka ya; nʼihi mmehie ahụ o mere ka ọ ga-anwụ. 27Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya. 28Nʼihi na ọ tuleela nʼobi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ. 29Ma ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Ọ bụ nʼụzọ m niile ezighị ezi, unu ụlọ Izrel? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi?

30“Ya mere, unu ụlọ Izrel, aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. Chegharịanụ, sitenụ na njehie unu niile unu chigharịa, mgbe ahụ, mmehie agaghị a bụrụ unu ihe ịsọ ngọngọ. 31Wezuganụ njehie niile unu jehiere nʼime ya, ka unu nweta obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Ụlọ Izrel, gịnị mere unu ga-eji nwụọ? 32Nʼihi na ọ dịghị atọ obi m ụtọ ịhụ na onye ọbụla na-anwụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Chegharịakwanụ, ka unu dịrị ndụ!

Copyright information for IboBIU